HOME PAGE PERSONAL PROFESSIONAL MAIL LOGIN
 

 

“Ayị nọ n’ọmenanị”:
Nkata Eziafọ Ọkarọ, If’ude Ejiọfọ, Ezechinyẹlugo na C. Krydz Ikwuemesị kpalụ n’Ogidi, Anambra State, Nigeria, n’ọnwa August 2004

 

Click here to Read the English Version

 

Krydz: Kedu ịfe bụ uli? Kedu k’unu si ed’ye mgbe an’ed’ye?

 

Eziafọ: Mgbe an’ed’ye, ọ n’abụ ayị wẹta ịfe nkwụ, apịchasịa nya, wẹl’ye wee melụ ọbala uli, bụ ịf’eji ede uli n’arụ mmadụ.

 

Krydz: Tupu e weta nya bụ ọbala uli, kedụ ebebe esi e weta uli? Kedụ k’esi akwadobe nyabụ uli tupu e deb’ye?

 

Eziafọ: Ọ n’abụ e jee n’osisi uli, a ghọta mkpụlụ’ya, kpụa nya akpụa m’ọbụ sue nya esue, wee tiny’ye n’ịfe a n’akpọ eju, wee wel’ye debe Ịfe nụụ e si na nkwụ wee weta bụ ọbala uli k’a y’eji wee n’d’ye n’arụ mmadụ.

 

Krydz: Ndị ụfọdụ n’akpọkw’ya mma nw’uli.

 

If’udẹ: Mba. Mmanw’uli d’iche.

 

Eziafọ: Mmanw’uli n’abụ igwe k’eji e m’ye.

 

Krydz: Kee mgbe eji ede uli a? Kee mgbe eji ed’ye iche? K’ọ n’abụ ọnye ọgụralụ ọ dee?

 

Eziafọ: Ọ nwerọ mgbe iche. Ọ ọnye desịa nya, okporu kwa, ọ dekwa.

 

Krydz: Nya, ọ nwerọ…

 

Eziafọ: Nya, n’izu m’ọbụ izu n’abọ, nk’edelụ kpochapụ, edekwa ọzọ.

 

Krydz: Mana ay’ed’ye, kee k’e si akwadobẹ arụ mmadụ? Ọ bụ ọny’afụ pụta raa ọ deb’ye n’arụ mmadụ? K’ọ nwee ịfe a y’eme tupu edeb’ye?

 

Eziafọ: Ẹkeraalụ n’ay’ede yi uli, ị je wụa arụ, ọ maa mma. Ị pụtazịa, ị tee ufịe. Ufịe nụụ kọsịa, ị dọnọ, e wee bido n’aka wee debe. E desịzịa n’aka, i din’edine, e wee debe n’ebe ndị ọzọ.

 

Krydz: Ndị n’ede uli, ọ nwelụ ụgwọ an’akwụ fa iche mgbe a? k’ọ ị yọta enyi gị m’ọ bụ ọnye ị maalụ, ọ dee gị?

 

Eziafọ: Etu e si ẹm’ye bụ na mụ na’gị dị mma; ị malụ n’ede, m malụ n’ede, m desịa gị, ị dee m. Anyị ar’arụọkwọ ọnụ. Kama n’ọnye fụ y’a bịa k’e dee nya uli, ọ bịa nii, o chulu mmili, m’ọbụ bute nkụ, maka n’ọ n’afịa arụ o.

 

Krydz: Nke a n’ede n’aja, dịka n’ụnọ mmọnwụ, m’ọbụ n’ebe dịgasị iche iche, dịka n’aja be mmadụ, ọ bụ kwu n yọta k’a n’yọta kwu nke a? K’ọ nwee mgbe n’abụ o lue, ụmụ nwanyị akaa wee jee dekọọ nya ọnụ?

 

Eziafọ: Etua fụ ị bụ nw’okolobia, ọ bụlụ mgbẹ nk’ayi, ị wẹẹ lụsịa ụnọ izizi gi ọ dị, ị chekwube m, malụ na m g’emelụ ị nya ọ maa mma, ị bị gwa m, agwa m ndi nwem; maka n’ọ bụrọ nke kịtaa n’abụ ọnye kwadoo ọ pụba n’ya apụbaragwo. Mgbe afụ, ị y’agwa ndị nwe gi nụ, f’ewee sị gị jee, ị jebe. Etu mụnwa n’etesịalụ mmadụ ụnọ n’aneme Nwafọ, m kpọlụ ọnye g’abụ ọ n’ete ete ana m arị akịka, n’ọbụrọ ịfe m maalụ k’ọnye afụ maalụ. Edesị raa n’ya, ọnye e dee lụ efee azụ ụnọ selụ ofu diọkpa sị ya pii n’ana, si ọnye mụ n’ya yị nya jee sibe. Mgbe afụ, mụnwa asị na mụ ana, na chi ejigwo, maka na mgbe nke ayị dị’asọ, n’ọ bụrọ kịtaa mmadụ n’akpa k’ewu. Ọnye fụ dọnọzịa sib’ye sisie, ọ ketalụ m nke m, wet’ya  na be ayi, welụ nk’ye naba. Nya n’ayị adịrọkwọ arụ ọnụ.

 

Ọ dị fụ ka isia a n’akpa. Ndooli n’ọbụ ntutu, ama m n’ọbụ ajị anụ? Mgbe nke’yị, ayị ar’akwụọkwọ ụgwọ, n’ọbụ ịkpasịa m, a kpam gị.

 

Krydz: Ọ dị nma. Ọzọ bụlụ.... ị kwuu fụ n’ay’eme Nwafọ na mmadụ nw’ike kpọọ gị ị deelie, m’ọbụ ọnye lụ lụ ụnọ ọfụụ. Mana a n’ed’ye mpụ? Ọ n’a bụ ọnye nọkata ọ debe uli mgbe sọlịa m’ọ bụ k’ọ si sọ ya?

 

Eziafọ: Ọnye ọ kwelụ mụta nụ! Na nke mụnwa bụ Eziafọ Agbaelo, bụ n’ọnye m delụ uli pụta raa n’ọfala igwe, mgbe igwe n’agba ọfala, a sị ya, Eweee! Ọkwọ Eziafọ Agbaelo delụ ọnyea uli. A gbakọnyọ n’ebefu. Ọtọ tejaa! Ekpurọ ọgọdu n’isi, amarọ n’ukwu. A n’ẹnẹnẹ ụdị uli edel’ye n’arụ, ma n’ike. Uli n’adị n’ụdị n’ụdị. Nke arụ ọnye chọlụ, e dee nya. Mana a maalụ aka uli m; n’uli dị n’aka n’aka.

 

Krydz: Kedụ ka e si akụzilụ ndị mmadụ ịde uli?

 

If’ude: K’e si akuzi ye bụ ọnye nwelụ anya nka, ị weta ọbala uli, ị n’ede, ọ n’ene gị anya etu i si ede. Ọ bụrọkwọ k’ọ nalụ ya ọbala debe, m’ọ bụ k’ị jide’ye aka k’ọ n’ede. N’ọ bụ anya k’ọ ga n’ene gị na nkpịsị aka ị ji ede k’ọ wee mụta. Ọ bụlụ n’ọ nwelụ anya nka, ọ mụta. Ọ mụtarọ, ọ dịba, ọ na yọ nkuzi wee lue n’ọ mụta.

 

Krydz: Uli a n’ede n’arụ, ma nke a n’ede n’aja, ọ nwelụ ịfe ọ n’egosi? Ọ nwelụ ịfe uli n’alụ?

 

If’ude: Uli bụ ịfe ụwa n’eme, ayị wee pụt’ụwa kwud’ye, wee solu meb’ye. Ọ bụ nka, bụlụ ịf’e ji achọ nma. Nya melụ ọ nwee ịfe a n’eme, ị chọba ọnye maalụ ede uli y’abụ ọ desịa nya a n’agba gi nkili, jụba ese ọnye del’ye.

 

Krydz: Ịfe m nali ajụ  bụ, ewerụka achọm nma, ọ nwelụ ịfe ọzọ nyabụ uli n’alụ, bụ n’uli adigh ịfe emebie?

 

If’ude: Ọ nwerọ ịfe ọ n’alụ iche, man’ọ dị nkpa. Ọọ ịfe e ji edozi arụ, nke bụ na mgbe gboo, nwanyi m’ọ bụ agbọghọ edegh uli ọ dịk’ọ na kwa mmadụ.

 

Krydz: Kedụ k’unu g’esi wee ji ụwa mgbe gboo tụnyelụ ịfe dị n’ọge a? Mbụ ọbịalụ n’azị?

 

If’ude: Ayi ameji ọge nk’ayi wee tụnyelụ ịfe afụlụ n’ọge a. K’ọ dị gboo abụrọ k’ọ dị kịtaa. Mgbe a, anyi amarọ ịfe an’akpọ akwa, m’anyi enwerọ ịfele. Ọ nwerọ ọnye n’asọ ib’ye arụ. M ňụlụ mmili, m bunye gị. Mana kịtaa ọnye ọdị n’asọ ib’ye arụ. Gị n’ọnye a, unu y’elikọ nni n’ofu efele (ọ n’alụ Okey Nwafor aka)? Unu y’em’ye?

 

Omume ayị bụ ndị gboo dịịlụ anyị mma, na unu bụ azị ghal’agha, ịfe dị n’arụ unu wee ghasaa.

 

Eziafọ: Fa n’akpazị k’ewu!

 

If’ude: Nyaa n’ayi nọ n’ọmenanị, anyị ak’esepụrọ aka n’ya.

 

Krydz: Ịfe ikpeazụ m g’ajụzị bụ ife gbasalụ ụka. Kịtaa mmadụ nine n’eje ụka, ụwa nine n’ej’ye, ọ dịkwazị k’ịfe ọjọọ ọ bawanyelụ. Mgbe nke unu, ọ si etua wee dị? Unu fụlụ ndị ọcha, solu bụlụ ndị mbụ fụlụ nyabụ ụka?

 

If’ude: Mgbe gboo, ọ bụlụ na mmadụ anwụrụ n’obodo, ar’akpa ọke, m’ọnye a ọ bụ ọnye ụka m’ọ bụ ọnye “hiden”. A n’emekodo ịfe ọnụ. Ọnye “hiden” nwụa, ndị ụka adiọkwọ asị ka fa pụa, n’ụmụnna nine g’anọ solu kwaa nya. Man’ọnye ụka nwụrụzịa, a sị n’aya gbarọ egbe, n’aya etirọ ekwe, na ndị ọcha achọr’ya. Ọ mgbe a k’ịfe ji wee mebie. Eluzie, ọnye “hiden” nwụrụzịa ụfọdụ akwụlụsịa, chil’aka wụị na “pọketi”, sị na fa bụ ndị ụka. Fa wee si etua wee wel’ye n’aga, wee mebisie ife. Apụtazịa, a sị n’ịfea bụ alụ, n’adịrọ em’ye eme, fa agbado ụkwụ n’ya n’emesie ike. Ọ bụlụ n’aghalụ ọmenana ligolu enu, ebee k’a y’akwụ? N’ụwa kịtaa ụfọdụ n’eje ụka n’agwọ nsị. Ara m ejekwọ ụka; ara m ekee ịje nụ wee lue nwanne echi.

 

Eziafọ: Ọ bụlụ ma mu bu Eziafọ Agbaelo, ọ m’ọ bụ mbịazịa ụwa ọzọ e bido m n’isi wee jebe ụka. Ọ bụlụ ma nke kịtaa, m m’ejerọ, n’afa n’eli alụ n’ọnụ.

 

Kịtaa, a’y’eme mmọọ, a sị n’ọbụ ịfe ekwensu, mbụ ịfe eji egwuli egwu, ịfe eji enwe aňụlị.

 

Krydz: Ezechinyelugo, ọnwelụ ịfe ị nwelụ ike itinye n’ife fa kwulu maka uli?

 

Ezechinyelugo: Mgbe gboo, a d’ego uli ego. O julu ebe nine. Mgbe afụ, ndị n’amụ ịde uli bụ ụmụaka ka fa ji amụ. Emegide, f’edebe ọkenye ibe fa. Ọnyea dee ib’ye, ib’ye edee nya, fa ewee n’amụta. Ọnye mụtazịa nya, achọb’ya achoba. Mgbe afụ a n’asị n’aka uli ọnye a amaka.....

 

Krydz: Nya n’uli di n’aka n’aka?

 

Ezechinyelugo: Oh oou! Uli di n’aka n’aka nụ. Ịfe ụwa dị n’aka n’aka. Igụ akwụkwọ, ịde ịfe dị dị n’aka n’aka. Uli bụ “hand writing” ndị gboo. Ọnye dekalịa, ọ bụlụ b’ye k’aga n’eji okwu uli. A n’achọj’ye, n’akpajel’ye nkụ, n’echujel’ye mmili, k’o wee dee nya. Ma nw’ikolobia o, ma nw’agboghobia o, ma ndi nne nwanyị o. Nne nwanyị dekata uli dedebe, ajụb’ya m’ọ dịkwọ na mma. Nyaa n’ịfe nine ụmụ nwanyị a kwulu kịtaa bụ ezi okwu. Ụwa adịrọzị k’ọ dị mbụ.

 

Ị bịa kwa n’ịfe gbasalụ uli, ndị gboo ndị b’ayị, ọkasị ndi Umudiọka, ji kw’ya akpa ego n’ọsụ, nyaa n’akụkụ Imo, wee gbagobe. Mgbe a, fa bulu ụkpa fa, uli eju’ye, ufịe eju ye, fa ewee binie. Mbọsi fa y’anata, anwụkọjụe ọkụkụ, chịlụ akwa “George” bụ ịfe fa ghọlịtaa n’aghụghọ. Maka n’ọ n’abụ fa lue n’ọsụ f’ewelụ uli m’ọbụ ufịe fee mmadụ na nzuzo sị ya n’ọya ojii m’ọbụ ọya ọzọ atụg’ye. Ọnye y’efe uli m’ọbụ ufịe fee, ọnye y’agwọ agwọ apụta kwue n’ya g’agwọ. Ọ sọ ya, ọ sị n’ọ g’ewe abanị ise m’ọbụ isii iji wee gwọ nyabụ ọya. Mgba a, ọ dị m ka f’enwerọ nya bụ uli. Amarọ m m’afa enwegwo kịtaa....

 

If’udẹ: Ee. F’enwegw’ye

 

Ezechinyelugo: Fa luzie mgbe a mẹbẹ mẹsịa, fa ebukọsịkwa ịfẹ fa bụ, n’ife nine fa nakọtalu fa – ego, ọkụkụ, akwa – wee bulu nata. I fug’ye? N’ọbụ ndị Umudiọka n’eme nke a, n’ayi adiọkwọ eje ọsụ. Nyaa na “419” (aghụghọ n’eriri) dịbalụ gboo, n’ọọ k’ịfe n’apụta zị k’a na ab’ya afa!

 

Nya na ịfe ụmụnwanyi a gwalụ unu bụ ka mgbẹ gboo si wee dị. Ayị kwudolu mgbe a nara ama akwa chaa, a ra eyi afe. Ọ bụrọkwọ n’efe a dịrọọ. N’ọ n’egotalụ gi efe, n’ọ mbọsị ụka k’eji eyikali ya. Ikekwọ, e gotalụi nya ibọọ, ofu abụlụ nke iji anọ n’ụnọ, ofu abụlụ nke iji eje ụka, m’ọ bụlụ n’i n’eje. Ndị “hiden” mgbe a adịrọ eyikebe akwa, ọ gbalụ ọtọ ọ n’agalụ ọnwe’ye. Nwanyi d’ime nwelụ ike ọ dịkata, ọ malụ akwa. Ọ nwerọ ọnye n’atụ ib’ye egwu, ọtọ enwero ịfe eji’ye wee kpọlụ. Ụmụnwanyị debe uli desịa n’arụ fa, ọ bụlụ ekike pụlụ iche, bụlụ efe ọ yi wee n’aga. Ufịe a n’agwa gị, etesịa nya n’arụ mgbe a, ọ n’edozi arụ. Akpụkpa ar’ata ọnye n’ete ufie, maka n’ọgwụ akwọtalụ n’osisi k’ọ bụ. Ọ dịlịlị n’afịa. Ndị Yoruba n’elekwu ye.

 

Nyaa n’ụwa ayi nọ n’ya, ịfe n’agafe agafe. Ndị nọsịa, ụwa nke fa agafee.

 

 

 

home personal professional contact mail

 

Copyright © Heavensgate

Site Designed by Purpletriangle Communications